Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 25:6-25 Bible Nso (IGBOB)

6. Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.

7. Ha we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, Nebukadneza me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, ha were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ha we me ka ọ ba na Babilon.

8. Ma n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-iri-na-iteghete nke eze, bú Nebukadneza, eze Babilon, ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, orù eze Babilon, biaruru Jerusalem:

9. o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.

10. Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.

11. Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.

12. Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.

13. Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.

14. Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

15. Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

16. Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

17. Cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di, isi nke di n'elu ya bu kwa ọla: idi-elu isi ahu di cubit atọ; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na ihe-ọkpukpa.

18. Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:

19. o si-kwa-ra n'obodo chiri otù onozi nke emeworo onye-nlekọta ndikom agha: na ndikom ise nime ndi nāhu iru eze, ndi achọtara n'obodo; na ode-akwukwọ, bú onye-isi usu-ndi-agha, onye nēme ka ndi ala ahu zukọta ibu agha; na ọgu ndikom atọ nime ndi ala ahu, ndi achọtaworo n'obodo.

20. Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, we chiri ha, me ka ha jekuru eze Babilon rue Ribla.

21. Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Eze we me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.

22. Ma ndi fọduru n'ala Juda, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha fọdu, o we me Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, ka ọ buru onye-nlekọta-ha.

23. Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.

24. Gedalaia we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si ha, Unu atula egwu n'ihi ndi-orù ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon òfùfè, ọ gādi-kwa-ra unu nma.

25. O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 25