Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 24:14-17 Bible Nso (IGBOB)

14. O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.

15. O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

16. Ndikom nile kwa ndi bu dìnkpà, nnù iri-na-asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-uzú, nnù abua na ọgu iri, ha nile bu ndi-dike, ndi nēbu agha, eze Babilon we me ka ha bia Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

17. Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n'ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 24