Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 22:4-17 Bible Nso (IGBOB)

4. Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n'aka ndi Israel:

5. ka ha nye kwa ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova: ka ha nye kwa ya n'aka ndi nēje ozi nke di n'ulo Jehova, iji me ka ebe etipúru etipú di ike;

6. ka ha nye ya n'aka ndi-ọ̀kà n'osisi, na n'aka ndi nēwu ulo, na n'aka ndi nēdo nkume; na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ulo ahu di ike.

7. Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n'aka-ha; n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe.

8. Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, we si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu, ọ gua ya.

9. Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n'ulo ahu, ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova.

10. Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.

11. O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke akwukwọ iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

12. Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

13. Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi.

14. Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.

15. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

16. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo:

17. n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe muye ọnumam dika ọku megide ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 22