Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 1:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n'úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu.

9. O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.

10. Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

11. O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata.

12. Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ndi-Eze 1