Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 34:19-29 Bible Nso (IGBOB)

19. O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

20. Eze we nye Hilkaia, na Ahaikam nwa Shefan, na Abdon nwa Maika, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

21. Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi fọduru n'Israel na nime Juda, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke awusaworo ayi, n'ihi na nna-ayi-hà edebeghi okwu Jehova, ime dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ a.

22. Hilkaia, na ndi ahu eze gwara, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tokhat, nwa Hasra, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu otú a.

23. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

24. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ ahu nke ha guworo n'iru eze Juda:

25. n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe wusa ọnumam n'ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

26. Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

27. n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

28. Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.

29. Eze we ziga, chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 34