Hilkaia, na ndi ahu eze gwara, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tokhat, nwa Hasra, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu otú a.