Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 28:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, na mb͕e ahu, na ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ibuso Israel agha. Ekish we si Devid, Mara nke-ọma na mu ka i gēso pua ba n'ọmuma-ulo-ikwū, gi onwe-gi na ndikom-i.

2. Devid we si Ekish, N'ihi ya gi onwe-gi gāmara ihe orù-gi gēme. Ekish we si Devid, N'ihi ya onye nēdebe isim ka m'gēdo gi ubọchi nile.

3. Ma Samuel anwuruwo, Israel nile we tiere ya aka n'obi, lì kwa ya na Rema, bú n'obodo-ya. Sọl ewezugawo kwa n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa.

4. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha, bia, ma ulo-ikwū-ha na Shunem: Sọl we chikọta Israel nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Gilboa.

5. Sọl we hu ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, o we tua egwu, obi-ya we ma jijiji nke-uku.

6. Sọl we jua Jehova ase, ma Jehova azaghi ya, Ọ zaghi na nrọ, ma-ọbu n'Ìhè, ma-ọbu n'ọnu ndi-amuma.

7. Sọl we si ndi-orù-ya, Chọrọnum nwayi nwere mọ ọ nāju ihe, ka m'we jekuru ya, jua ya ase. Ndi-orù-ya we si ya, Le, otù nwayi di n'En-doa nke nwere mọ ọ nāju ihe.

8. Sọl we nwogharia onwe-ya, yiri uwe ọzọ, je, ya onwe-ya na ndikom abua tiyere ya, ha we biakute nwayi ahu n'abali: ọ si, Biko, were mọ i nāju ihe juaram ase, me ka ọ rigokutem, bú onye ọ bula m'gāsi gi.

9. Nwayi ahu we si ya, Le, gi onwe-gi amawo ihe Sọl mere, na o bipuwo n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāb͕ara ndum ọnyà ime ka m'nwua?

10. Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n'ihe a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 28