Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 21:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,

18. Bilie, ridata izute Ehab, bú eze Israel, onye bi na Sameria; le, ọ nọ n'ubi-vine Nebot, ebe ọ ridara inweta ya.

19. Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.

20. Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

21. Le, M'nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M'gēkpochapu ndi-gi fọduru, M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, ka Jehova kwuru:

22. M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.

23. Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n'ékpè Jezreel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 21