Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 20:16-31 Bible Nso (IGBOB)

16. Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.

17. Umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi we buru uzọ pua; Ben-hedad we zipu, ha we gosi ya, si, Ndikom esiwo na Sameria puta.

18. Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu.

19. Ma ndia siri n'obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n'azu.

20. Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya.

21. Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria.

22. Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.

23. Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n'ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha.

24. Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n'ebe-ya, do ndi nāchi ala n'ọnọdu ha:

25. ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n'agha, inyinya n'ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n'ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a.

26. O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha.

27. Agukọta-kwa-ra umu Israel, nye ha ihe-oriri, ha we je izute ha: umu Israel we ma ulo-ikwū-ha n'iru ha dika ìgwè ewu ntà abua; ma ndi Siria juputara ala.

28. Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n'ihi ya ka M'gēnye ìgwè uku a nile n'aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

29. Ha we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n'ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n'otù ubọchi.

30. Ndi fọduru we b͕alaga n'Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n'obodo, n'ime-ulo nke di n'ime-ulo.

31. Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n'úkwù-ayi, na udọ̀ n'isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 20