Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya.