Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 12:16-34 Bible Nso (IGBOB)

16. Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid.

17. Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.

18. Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.

19. Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl.

20. Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase.

21. Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha.

22. N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.

23. Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di.

24. Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha.

25. Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise.

26. Site n'umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri.

27. Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya;

28. na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua.

29. Site kwa n'umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n'ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl.

30. Site kwa n'umu Efraim, orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-abua, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha n'ulo nke ndi bu nna-ha.

31. Site kwa na nkera ebo Manase, orú nnù uzọ abua na nnù ise, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ibia ime Devid eze.

32. Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.

33. Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n'usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n'usoro, nēnweghi obi abua.

34. Site kwa na Naftali, nnù ndi-isi abua na ọgu iri, orú nnù ndikom uzọ anọ na nnù iri-na-abua na ọgu iri so-kwa-ra ha nāchi uta na ube.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 12