Site kwa n'umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n'ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl.