isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 31 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Le, akpọwom Bezalel n'aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda:

3. emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula,

4. icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla,

5. na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà na idukọta ya adukọta, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula.

6. Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n'obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M'tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M'nyeworo gi n'iwu:

7. ulo-ikwū nzute, na ib͕e nke diri ihe-àmà ahu, na ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ya, na ihe nile nke Ulo-ikwū ahu;

8. na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,

9. na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya:

10. na uwe nile akpara nke ọma, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-aja, nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà;

11. na manu nke otite-manu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, bú nke diri ebe nsọ ahu: dika ihe M'nyeworo gi n'iwu si di, otú a ka ha gēme.

12. Jehova we gwa Moses okwu, si,

13. Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N'ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n'ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ.

14. Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n'ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n'ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n'etiti umu-nna-ya.

15. Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua.

16. Ma umu Israel gēdebe ubọchi-izu-ike, ime ememe ubọchi-izu-ike ahu rue ọb͕ọ-ha nile, ọ bu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

17. Ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, ma ọ bu n'ubọchi nke-asa ka Ọ kwusiri n'ọlu-Ya, wee zuru ike.

18. Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.