Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 25:18-27 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma mb͕e ndi nēbo ya ebubo guzoro ọtọ, ha ejighi ihe ọ bula nime ihe ọjọ mu onwem chère we bo ya;

19. ma ha ji ajuju ufọdu megide ya bayere nsọpuru-chi nke aka ha, na ajuju bayere otù Jisus, Onye nwururi anwu, Onye Pọl nāsi na Ọ di ndu.

20. Ebe mu onwem nwere obi abua otú m'gāju ajuju bayere ihe ndia, m'we jua ma ọ chọrọ iga Jerusalem, ka ekpe kwa ya ikpé bayere ihe ndia n'ebe ahu.

21. Ma mb͕e Pọl kpọrọ ka edebe ya nye ntule Ọgustọs, m'we si ka edebe ya rue mb͕e m'gēziga ya jekuru Sisa.

22. Agripa we si Festọs, Ọ gādim nma ka mu onwem nuru kwa nwoke ahu. Ọ si, Echi ka i gānu ya.

23. Ya mere echi-ya, mb͕e Agripa biara, ya na Banaisi, n'oké ebube, bata kwa n'ulo ọnunu-okwu, ha na ndi-isi-ọchi-agha, na ndikom amara aha-ha n'obodo ahu, mb͕e Festọs kwuru ewe kuta Pọl.

24. Festọs we si, Eze Agripa, na ndikom nile ayi na unu nọ n'ebe a, unu ahuwo onye a, onye ọra ndi-Ju nile riọrọm aririọ bayere ya, ma na Jerusalem ma n'ebe a, nēti nkpu na ọ di nkpà ka ọ ghara idi ndu ọzọ.

25. Ma mu onwem huru na o meghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu: ma mb͕e ya onwe-ya kpọkuru Ọgustọs, m'we kpebìe iziga ya.

26. Ma enweghm okwu di itukwasi obi bayere ya idegara onye-nwem. N'ihi ya ekuputaram ya n'iru unu, ma nke ka n'iru gi onwe-gi, Eze Agripa, ka, mb͕e ekpesiri ya ikpé, ka m'we nwe ihe m'gēde n'akwukwo.

27. N'ihi na ọ dim ka ọ bu ihe uche nādighi ya, n'iziga onye-nkpọrọ, ka m'ghara igosi kwa ihe eboro ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 25