Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 21:25-39 Bible Nso (IGBOB)

25. Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n'àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko.

26. Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n'ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n'ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n'iru Chineke onyinye ahu n'ihi madu nile n'otù n'otù nime ha.

27. Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n'Esia bia, mb͕e ha huru ya n'ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka,

28. nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.

29. N'ihi na ha buri uzọ hu ya na Trọfimọs onye Efesọs n'obodo, onye ha nēchè na Pọl dubatarari n'ulo uku Chineke.

30. Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.

31. Mb͕e ha nāchọ uzọ ib͕u ya, akukọ we rigo rue nti onye-isi-ọchi-agha nke òtù ndi-agha, na Jerusalem dum nāb͕a aghara.

32. Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe.

33. Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.

34. Ufọdu nime ìgwè madu ahu we ti nkpu otù ihe, ndi ọzọ ti kwa ihe ọzọ: ma mb͕e ọ nāpughi imata okwu di itukwasi obi n'ihi ùzù ahu, ọ si ka ekuru ya ba n'ulo ndi-agha.

35. Mb͕e o ruru n'elu ihe eji arigo, o rue na ndi-agha buru ya n'ihi ihe-ike nke ìgwè madu ahu;

36. n'ihi na ọra ndi-Ju nēso n'azu, nēti nkpu, si, Wepu ya.

37. Mb͕e agaje ikubà Pọl nime ulo ndi- agha, ọ si onye-isi-ọchi-agha, Ì gēkwe ka m'gwa gi okwu? O we si, Ì mara asusu Grik?

38. Gì onwe-gi abughi kwa onye Ijipt ahu, onye mb͕e ubọchi ndia akērughi kpaliri nnù ndikom iri ahu n'etiti Ndi-ob͕u-madu, dupu kwa ha ba nime ọhia?

39. Ma Pọl siri, Mu onwem bu onye-Ju, nke Tasọs nime Silisia, onye amuru n'obodo amara aha-ya: ariọkwam i, kwe ka m'gwa ndi-Ju okwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 21