7. Site n'ebo Simeon orù nnù na nnù iri:Site n'ebo Livai orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Isaka orú nnù na nnù iri:
8. Site n'ebo Zebulum orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Josef orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Benjamin orú nnù na nnù iri:
9. Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;
10. ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu.
11. Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n'ala n'iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,
12. si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
13. Otù n'etiti ndi-okenye ahu we za, sim, Ndia ndi eb͕okwasiworo uwe-nwuda ahu di ọcha, hà bu ole ndi, òle ebe ha si bia kwa?