isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 7 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e nka gasiri m'we hu ndi-mọ-ozi anọ ka ha nēguzo n'elu nkuku anọ nke uwa, nējidesi ifufe anọ nke uwa ike, ka ifufe ọ bula we ghara ife n'elu uwa, ma-ọbu n'elu oké osimiri, ma-ọbu n'elu osisi ọ bula.

2. M'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n'ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri,

3. si, Emejọla uwa, ma-ọbu oké osimiri, ma-ọbu osisi, rue mb͕e ayi gākasiwo ndi-orù Chineke-ayi akàrà n'egedege-iru-ha.

4. M'we nu ọnu-ọgugu ndi akarari, ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, ndi akarari akàrà site n'ebo nile ọ bula nke umu Israel.

5. Akarari akàrà site n'ebo Juda orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Reuben orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Gad orú nnù na nnù iri:

6. Site n'ebo Asha orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Naftali orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Manase orú nnù na nnù iri:

7. Site n'ebo Simeon orù nnù na nnù iri:Site n'ebo Livai orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Isaka orú nnù na nnù iri:

8. Site n'ebo Zebulum orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Josef orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Benjamin orú nnù na nnù iri:

9. Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;

10. ha we were oké olu tie nkpu, si, Nzọputa diri Chineke-ayi, Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, di-kwa-ra Nwa-aturu ahu.

11. Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n'ala n'iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,

12. si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

13. Otù n'etiti ndi-okenye ahu we za, sim, Ndia ndi eb͕okwasiworo uwe-nwuda ahu di ọcha, hà bu ole ndi, òle ebe ha si bia kwa?

14. M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.

15. N'ihi nka ka ha nọ n'iru oche-eze Chineke; ha nēfè kwa Ya òfùfè ehihie na abali n'ulo nsọ Ya: Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu gāb͕asa kwa ulo-ikwū-Ya n'isi-ha.

16. Agu agaghi-agu ha ọzọ, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku ọzọ; anyanwu agaghi-acha kwa ha ọzọ, ma-ọbu okpom-ọku ọ bula:

17. n'ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n'etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n'isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha.