Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 21:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.

9. Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M'gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu.

10. O we bupum nime Mọ Nsọ ga rue oké ugwu di elu, we gosim obodo nsọ ahu, bú Jerusalem, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ,

11. nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal:

12. o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n'ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel:

13. n'akuku Ọwuwa-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di; n'akuku Ugwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ndida ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n'akuku Ọdida-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa.

14. Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n'elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu.

15. Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya.

16. Obodo ahu nwe-kwa-ra nkuku anọ ra nrata, ogologo-ya ra kwa ka obodobo-ya: o we were amì ahu tùa obodo ahu, orú nnù furlong na nnù iri: ogologo-ya na obodobo-ya na elu-ya ra.

17. O we tù mb͕idi-ya, ọgu cubit asa na anọ, dika ọtùtù madu si di, ya bu, nke mọ-ozi.

18. Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 21