Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 2:20-29 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma enwerem nka imegide gi, na i kwere nwanyi ahu, bú Jezebel, onye nākpọ onwe-ya onye-amuma-nwanyi; o nēzí kwa ndi-orùm ihe, nēduhie kwa ha, ka ha kwa iko, ri kwa ihe achuru n'àjà nye arusi.

21. Enye-kwa-ram ya oge, ka o we chègharia; ma ọ chọghi ichèghari n'ikwa-iko-ya.

22. Le, anamatubà ya n'ihe-nkpab͕u, tubà kwa ndi soro ya kwa iko nime oké nkpab͕u, ma asi na ha echègharighi n'ọlu-ya.

23. M'gēwere kwa ọnwu b͕ue umu-ya; nzukọ Kraist nile gāmara kwa na Mu onwem bu onye nēnyocha akuru na obi nile: M'gēnye kwa unu n'otù n'otù dika ọlu nile unu si di.

24. Ma unu ka m'nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.

25. Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M'gābia.

26. Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M'gēnye kwa ike ichi mba nile:

27. ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam:

28. M'gēnye kwa ya kpakpando ututu.

29. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 2