Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 2:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Degara mọ-ozi nke nzukọ Kraist di n'Efesọs akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nēji kpakpando asa ahu n'aka-nri-Ya, Onye nējeghari n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me:

2. Amataram ọlu-gi nile, na ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pughi inagide ndi ọjọ, i nwa-kwa-ra ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, ma ha abughi, i we hu na ha bu ndi-ugha;

3. i nwe-kwa-ra ntachi-obi, i bū-kwa-ra ibu n'ihi aham, ike akāgwughi kwa gi.

4. Ma enwerem nka imegide gi, na i rapuru ihu-n'anya ahu i nwere na mbu.

5. Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi, M'gēwepu kwa ihe-idọba-oriọna-gi n'ọnọdu-ya, ma asi na i chègharighi.

6. Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 2