Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 2:25-29 Bible Nso (IGBOB)

25. N'ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n'iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.

26. Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù?

27. onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n'ihe edeworo n'akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n'iwu?

28. N'ihi na onye nke bu onye-Ju n'anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n'anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù:

29. kama onye nke bu onye-Ju n'ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n'ihe edeworo n'akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n'aka madu, kama o sitere n'aka Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 2