isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 2 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n'ihi na i nāma onwe-gi ikpe n'ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n'ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu.

2. Ayi ma-kwa-ra na ikpé Chineke di ka ezi-okwu si di imegide ndi nēme ihe di otú a.

3. Ma ì nāgu nka, gi madu, nke nēkpe ndi nēme ihe di otú a, ma i nēme kwa ha, na gi onwe-gi gāb͕anari ikpé Chineke?

4. Ma-ọbu ì nēlelì àkù nke obi-ọma-Ya na nke nnagide-Ya na nke ogologo-ntachi-obi-Ya, ebe i nāmaghi na ọlu obi-ọma Chineke nēdubà gi na nchèghari?

5. ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;

6. Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:

7. ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:

8. ma ndi di n'akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,

9. nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n'elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa;

10. ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa:

11. n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.

12. N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé;

13. n'ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n'ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:

14. n'ihi na mb͕e ọ bula ndi mba ọzọ ndi nēnweghi iwu nēme ihe nile di n'iwu site ka esi mu ha, ndi ahu, ọ bu ezie na ha enweghi iwu, ma ha onwe-ha bu iwu enyere onwe-ha;

15. n'ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n'obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n'obi-ha n'etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha;

16. n'ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n'aka Jisus Kraist.

17. Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n'elu iwu, nānya kwa isi na Chineke,

18. nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n'iwu-gi,

19. ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n'ọchichiri,

20. onye nāzùputa ndi nēnweghi uche, onye-ozizí nke umu ọhu, ebe i nēnwe udi nke ihe-ọmuma na nke ezi-okwu n'iwu ahu;

21. ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?

22. gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?

23. gi onye nānya isi n'iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n'iwu ahu?

24. N'ihi na anēkwulu aha Chineke n'etiti ndi mba ọzọ n'ihi unu, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ.

25. N'ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n'iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.

26. Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù?

27. onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n'ihe edeworo n'akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n'iwu?

28. N'ihi na onye nke bu onye-Ju n'anya madu abughi onye-Ju; obibì-úgwù ahu nke madu nāhu anya, nke di n'anu-aru, abughi kwa obibì-úgwù:

29. kama onye nke bu onye-Ju n'ihe zoro ezo, onye ahu bu onye-Ju; obibì-úgwù bu kwa nke nkpuru-obi, nime mọ, ọ bughi n'ihe edeworo n'akwukwọ; nke otuto-ya nēsiteghi n'aka madu, kama o sitere n'aka Chineke.