Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 10:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke.

4. N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume.

5. N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya.

6. Ma ezi omume ahu nke sitere n'okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist:)

7. ma-ọbu, Ònye gārida n'abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist.)

8. Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa:

9. na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gí:

10. n'ihi na anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa.

11. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya.

12. N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye-Grik: n'ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọku Ya:

13. n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

14. Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi?

15. ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!

16. Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 10