Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 13:4-16 Bible Nso (IGBOB)

4. Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.

5. Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.

6. Ya mere ayi were obi-ike si,Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka;Gini ka madu gēmem?

7. Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha.

8. Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.

9. Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù.

10. Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta.

11. N'ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n'ebe nsọ site n'aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

12. N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo.

13. Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya.

14. N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia.

15. Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.

16. Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 13