Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 9:31-38 Bible Nso (IGBOB)

31. Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum.

32. Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji.

33. Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel.

34. Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

35. Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.

36. Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.

37. Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole.

38. Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 9