Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 9:28-35 Bible Nso (IGBOB)

28. Ma mb͕e Ọ batasiri n'ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi.

29. Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.

30. Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya.

31. Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum.

32. Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji.

33. Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel.

34. Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

35. Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 9