Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 9:17-24 Bible Nso (IGBOB)

17. Ha adighi-ab͕aye kwa manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, karama-akpukpọ ahu ab͕awa, manya-vine ahu we wusì, karama-akpukpọ ahu ala kwa n'iyì: ma ha nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu, anēdebe ha abua nke-ọma.

18. Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu.

19. Jisus we bilie, so ya je, ndi nēso uzọ-Ya so-kwa-ra.

20. Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka:

21. n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

22. Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu.

23. Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù,

24. Ọ si, Wezuganu onwe-unu; n'ihi na nwa-ab͕ọghọ ntà ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 9