Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 4:6-23 Bible Nso (IGBOB)

6. si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, tudà Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.

7. Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.

8. Ọzọ kwa, ekwensu kuru Ya ga ugwu di oké elu, we gosi Ya ala-eze nile nke uwa, na ebube-ha;

9. o we si Ya, Ihe ndia nile ka m'gēnye Gi, ọ buru na I gādà n'ala kpọ isi ala nyem.

10. Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

11. Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.

12. Ma mb͕e Ọ nuru na arara Jọn nye, O wezugara Onwe-ya je Galili;

13. O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:

14. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

15. Ala Zebulun na ala Naftali,N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,Galili nke ndi-mba ọzọ,

16. Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè,Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,Ndia ka ìhè walitere.

17. Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

18. Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.

19. O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu.

20. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

21. O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha.

22. Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.

23. Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 4