Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 14:16-35 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie.

17. Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua.

18. O we si, Chita ha n'ebe a nyem.

19. O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.

20. Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru.

21. Ma ndi riri ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri, nāgughi ndinyom na umu-ntakiri.

22. Ngwa ngwa O we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ, rue mb͕e Ya onwe-ya gēzilaga ìgwè madu nile.

23. Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n'elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n'ebe ahu.

24. Ma ub͕ọ ahu di n'etiti oké osimiri ub͕u a, ebili-miri nēmekpa kwa ya aru; n'ihi na ifufe nēfegide ya.

25. Ma na nche nke-anọ n'abali Ọ biakutere ha, nēje ije n'elu oké osimiri.

26. Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n'egwù.

27. Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu.

28. Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n'elu miri.

29. Ọ si, Bia. Pita we si n'ub͕ọ rida, je ije n'elu miri ahu, ijekuru Jisus.

30. Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam.

31. Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua?

32. Mb͕e ha rigoro n'ub͕ọ, ifufe we febìe.

33. Ma ndi nọ n'ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n'ezie.

34. Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala, rue Genesaret.

35. Mb͕e ndikom ebe ahu mazuru Ya, ha we ziga n'ala ahu dum di buruburu, kutara Ya madu nile aru nādighi nma;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 14