Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 12:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. O we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù n'oge ighọ nkpuru, ka ọ nata n'aka ndi-ọlu-ubi nkpuru ufọdu n'ubi-vine-ya.

3. Ha we jide ya, pia ya ihe, zilaga ya n'aka efu.

4. Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere.

5. O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu.

6. O nwere otù onye fọduru, bú ọkpara ọ huru n'anya: o zigara ya ikpe-azu jekuru ha, si, Ha gāsọpuru ọkparam.

7. Ma ndi-ọlu-ubi ahu siritara onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, ihe-nketa-ya gābu kwa nke ayi.

8. Ha we jide ya, b͕ue ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu.

9. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ.

10. Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ;Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:

11. Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?

12. Ha we chọ uzọ ijide Ya; ma ha turu egwu ìgwè madu ahu; n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha; ha we rapu Ya, la.

13. Ha we zigara Ye ufọdu nime ndi-Farisi na ndi Herod, ka ha we nwude Ya n'okwu.

14. Ha we bia, si Ya, Onye-ozizí, ayi amatawo na I bu onye ezi-okwu, na I dighi-asọ kwa onye ọ bula anya: n'ihi na I dighi-ele madu anya n'iru, kama I nēzi uzọ Chineke n'ezi-okwu: ò ziri ezi n'iwu itu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

15. Àyi gātu, ma-ọbu na ayi agaghi-atu? Ma ebe Ọ matara iru-abua-ha; Ọ si ha, Gini mere unu nānwam? wetaram otù shilling, ka M'hu ya.

16. Ha we weta ya. Ọ si ha, Ònye nwe onyinyo a na ihe a edekwasiri ya? Ha si Ya, Sisa nwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 12