Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 9:41-50 Bible Nso (IGBOB)

41. Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n'ebe a.

42. Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.

43. Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n'aru.Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

44. Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n'ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu.

45. Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.

46. Iru-uka we da n'etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n'etiti ha.

47. Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n'obi-ha, O jide nwatakiri n'aka, debe ya n'akuku Ya,

48. we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.

49. Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi.

50. Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 9