Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.