isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 9 Bible Nso (IGBOB)

1. O we kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n'ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche.

2. O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.

3. O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n'ije-unu, unu ewela nkpa-n'aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.

4. Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n'ebe ahu, si kwa n'ebe ahu pua.

5. Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n'obodo ahu tichapu ájá di n'ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.

6. Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n'ebe nile.

7. Ma Herod, bú tetrarch, nuru ihe nile emere: o we nēcheb͕u onwe-ya, n'ihi na ufọdu siri, na Jọn esiwori na ndi nwuru anwu bilie;

8. ufọdu si-kwa-ra, na Elaija aputawori ihè; ndi ọzọ si-kwa-ra na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwori n'ọnwu bilie ọzọ.

9. Ma Herod siri, Mu onwem bipuru isi Jọn: ma ònye bu Onye a, Nke m'nānu ihe bayere Ya di otú a? O we nāchọ uzọ ihu Ya anya.

10. Mb͕e ndi-ozi Jisus latara, ha we kọrọ Ya ihe nile ha mere, ka ha ra. O we chiri ha tiyere Onwe-ya, wezuga Onwe-ya iche rue obodo anākpọ Betsaida.

11. Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike.

12. Ma chi malitere iji; ndi-ozi iri na abua ahu we biakute Ya, si Ya, Zilaga ìgwè madu a, ka ha we ga n'obodo ntà nile na ubi nile di buruburu, nọ ọnọdu-abali, chọta kwa ihe ha gēri; n'ihi na ayi nọ n'ebe a nime ọhia.

13. Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile.

14. N'ihi na ha ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Menu ka ha nọdu ala n'òtù di iche iche, ihe dika ọgu madu abua na iri n'otù òtù.

15. Ha we me otú ahu, me ka ha nile nọdu ala.

16. O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ìgwè madu ahu.

17. Ha we rie, afọ ju-kwa-ra ha nile: ewe tutukọ iberibe fọduru ha, nkata iri na abua.

18. O rue, mb͕e nání Ya nọ nēkpe ekpere, ndi nēso uzọ-Ya nọyere Ya: O we jua ha, si, Ònye ka ọra madu nāsi na Mu onwem bu?

19. Ha we za, si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ndi ọzọ si, na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwo n'ọnwu bilie ọzọ.

20. O we si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si, Kraist nke Chineke.

21. Ma Ọ dọrọ ha aka na nti, nye kwa ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe a;

22. si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.

23. O we si ha nile, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya kwa-ubọchi, nēsokwam.

24. N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, onye ahu gāzọputa ya.

25. N'ihi na ùrù gini ka ọ nābara madu, ma ọ buru na o rita uwa dum n'urù, o we tufue ma-ọbu anapu ya onwe-ya?

26. N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme, ihere onye ahu gēme Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke aka Ya, na ebube nke Nna-Ya, na ebube nke ndi-mọ-ozi-Ya di nsọ.

27. Ma asim unu n'ezie, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke.

28. O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere.

29. Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.

30. Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;

31. ndi emere ka ahu ha anya n'ebube, ndi nēkwu kwa okwu bayere ọlila-Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem.

32. Ma ura jururi Pita na ndi ya na ha nọ n'anya: ma mb͕e ha tetara nke-ọma, ha hu ebube-Ya, na ndikom abua ahu Ya na ha guzoro.

33. O we rue, mb͕e ha si n'ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n'ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu.

34. Mb͕e ọ nēkwu okwu ndia, igwe-oji we bia, kpuchie ha: ha we tua egwu mb͕e ha nābà n'igwe-oji ahu.

35. Olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam, Onye M'rọputara: nurunu okwu-Ya.

36. Mb͕e olu ahu putasiri, ahuru nání Jisus. Ndi ahu we kpuchie ọnu-ha, ha akọghi kwa akukọ ihe ọ bula ha hururi nye onye ọ bula na mb͕e ahu.

37. O rue, n'ubọchi so ya, mb͕e ha siri n'ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya.

38. Ma le, otù nwoke si n'ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n'ihi na ọ bu nwam m'muru nání ya:

39. le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n'ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku.

40. M'we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi.

41. Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n'ebe a.

42. Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya.

43. Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n'aru.Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

44. Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n'ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu.

45. Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.

46. Iru-uka we da n'etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n'etiti ha.

47. Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n'obi-ha, O jide nwatakiri n'aka, debe ya n'akuku Ya,

48. we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.

49. Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi.

50. Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.

51. O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,

52. O we zipu ndi-ozi n'iru Ya: ha we ga, ba n'otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya.

53. Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n'ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem.

54. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha?

55. O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu.

56. N'ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n'iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n'obodo ntà ọzọ.

57. Mb͕e ha nāga n'uzọ, otù onye we si Ya, M'gēso Gi ebe ọ bula Ì nēje.

58. Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.

59. O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam.

60. Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke.

61. Onye ọzọ we si kwa, M'gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m'buru uzọ kele ndi nọ n'ulom ekele ikpe-azu.

62. Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n'azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n'ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.