Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 6:43-49 Bible Nso (IGBOB)

43. N'ihi na ọ dighi osisi ọma ọ bula nke nāmi nkpuru nābaghi n'ihe; ọzọ kwa, ọ dighi osisi ọ bula nābaghi n'ihe nke nāmi nkpuru ọma.

44. N'ihi na amara osisi ọ bula site na nkpuru nke aka ya. N'ihi na madu adighi-ekpokọta mkpuru fig site n'ogwu, ha adighi-aghọta kwa nkpuru-vine site n'obi-ogwu.

45. Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè.

46. Ma gini mere unu nākpọm, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, ma unu emeghi ihe nile M'kwuru?

47. Onye ọ bula nke nābiakutem, nke nānu kwa okwum nile, nke nēme kwa ha, M'gēgosi unu onye o yiri:

48. o yiri madu nke nēwu ulo, onye gwuru gwumi kwa, we tọ ntọ-ala n'elu oké nkume: mb͕e miri juru, osimiri we tikwasi ulo ahu, ma o nweghi ike ime ya ka ọ me nkpatu: n'ihi na ewuru ya nke-ọma.

49. Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n'elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 6