Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 12:49-59 Bible Nso (IGBOB)

49. Abiaram itusa ọku n'elu uwa; ma gini ka M'nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a?

50. Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n'obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya.

51. Ùnu nēchè na abiaram inye udo n'uwa? asim unu, É-è; kama nkewa:

52. n'ihi na site n'ub͕u a madu ise ndi kewaworo ekewa gādi n'otù ulo, madu atọ megide madu abua, madu abua megide kwa madu atọ.

53. Agēkewa ha, nna megide nwa-ya nwoke, nwa-nwoke megide kwa nna-ya; nne megide nwa-ya nwanyi, nwa-nwanyi megide kwa nne-ya; nne di megide nwunye nwa-ya, nwunye nwa megide kwa nne di-ya.

54. O we si kwa ìgwè madu nile, Mb͕e ọ bula unu huru igwe-oji ka o si n'Ọdida-anyanwu nārigo, ngwa ngwa unu nāsi, Nshansha-miri nābia; o were mee otua.

55. Mb͕e ọ bula unu hukwara ifufe Ndida ka ọ nēfe, unu nāsi, Ifufe di ọku gādi; o we me.

56. Ndi-iru-abua, unu matara itule iru ala na elu-igwe; ma òle ka o si di na unu amataghi itule oge a?

57. Ma gini mere unu adighi-ekpe n'onwe-unu ihe ziri ezi?

58. N'ihi na mb͕e gi na onye nēkuru gi ga ikpé nāga n'iru onye-isi, mesie ike ipu n'aka-ya n'uzo; ka ọ ghara idọkpuru gi nye onye-ikpé ma eleghi anya, onye-ikpé gārara kwa gi nye n'aka onye nēnye ndi-nmehie ahuhu, onye ahu nēnye ndi nmehie ahuhu gātubà kwa gi n'ulo-nkpọrọ

59. Asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi ọbuná ego ntà ikpe-azu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 12