Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jọn 21:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè ọzọ nye ndi nēso uzọ-Ya n'oké osimiri Taibirias; ma O mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè otú a.

2. Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe.

3. Saimon Pita si ha, Anamaga ib͕u azù. Ha si ya, Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je. Ha puru, ba n'ub͕ọ-ha; ma n'abali ahu ha egbughi ihe ọ bula.

4. Ma mb͕e chi nābọ ub͕u a, Jisus guzoro n'ótú: otú ọ di, ndi nēso uzọ-Ya amataghi na ọ bu Jisus.

5. Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è.

6. O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n'akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n'ihi ọtutu azù di ya.

7. Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri.

8. Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n'ub͕ọ ntà ha (n'ihi na ha anọghi n'ebe di anya n'ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya.

9. Ya mere mb͕e ha ridara n'ala, ha hu ọku icheku n'ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jọn 21