14. ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n'anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku.
15. Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:
16. otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.
17. Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
18. Iwu a ka m'nēnye n'aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka;
19. nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di:
20. ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.