Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 14:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Nāb͕asonu ihu-n'anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma.

2. N'ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi.

3. Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.

4. Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

5. Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

6. Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m'gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n'uzọ nkpughe, ma-ọbu n'uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n'uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n'uzọ ozizí?

7. Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n'olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ?

8. N'ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha?

9. Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n'ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 14