Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi Kọrint 14:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Nāb͕asonu ihu-n'anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma.

2. N'ihi na onye ji asusu di iche nēkwu okwu, ọ dighi-agwa madu okwu, kama ọ nāgwa Chineke; n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nānu ihe ọ nēkwu; ma o ji mọ-ya nēkwu ihe-omimi.

3. Ma onye nēbu amuma nāgwa madu okwu nke iwuli-elu dika ulo, na nke nkasi-obi, na nke ngugu-obi.

4. Onye ji asusu di iche nēkwu okwu nēwuli onwe-ya elu dika ulo; ma onye nēbu amuma nēwuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

5. Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.

6. Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m'gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n'uzọ nkpughe, ma-ọbu n'uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n'uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n'uzọ ozizí?

7. Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n'olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ?

8. N'ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha?

9. Otú a unu onwe-unu kwa, ma ọ buru na unu ejighi ire kwu okwu di nfe ighota, àgēsi aṅa mara ihe anēkwu? n'ihi na unu ganēkwu okwu nye ifufe.

10. Agāsi na ọtutu aha olu di iche iche di n'uwa, ọ dighi kwa ihe ọ bula nke nēnweghi olu.

11. Ya mere asi na amataghm isi olu ahu, m'gābu onye nāsu asusu ọzọ n'anya onye ahu nēkwu okwu, onye ahu nēkwu okwu gābu kwa onye nāsu asusu ọzọ n'anyam.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi Kọrint 14