Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 9:15-17 Bible Nso (IGBOB)

15. Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.

16. Jehova, bú Chineke-ha, gāzọputa kwa ha n'ubọchi ahu dika ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi-Ya: N'ihi na nkume di oké ọnu-ahia nke okpu-eze ka ha gābu, ndi eweliworo elu dika ọkọlọtọ n'elu ala-Ya.

17. N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 9