Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 8:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. otú a ka M'zubewo-kwa-ra ọzọ n'ubọchi ndia ime Jerusalem, ime kwa ulo Juda, nma: unu atula egwu.

16. Ndia bu ihe unu gēme; Kwuenu, onye ọ bula ọ gwa ibe-ya, ezi-okwu; Kpenu ikpe ezi-okwu na ikpe udo n'ọnu-uzọ-ama nile unu:

17. unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n'anya: n'ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M'kpọworo asì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18. Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

19. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.

20. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ gēru kwa ọzọ na ndi di iche iche na ndi bi n'ọtutu obodo gābia:

21. ndi bi n'otù obodo gējekuru kwa obodo ọzọ, si, Ka ayi jisie ike je ime ka iru Jehova dajua, na ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha: m'gēje, ọbuná mu onwem.

22. E, ọtutu ndi di iche iche na mba di iche iche di ike gābia ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nime Jerusalem, na ime ka iru Jehova dajua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 8