Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zekaraia 8:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we bia, si,

2. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Zaion oké ekworo, ejiwokwam oké ọnuma kworo ya ekworo.

3. Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.

4. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu ala ọzọ n'amá nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n'aka-ya n'aka-ya site n'iba-uba nke ubọchi ndu-ya.

5. Amá nile nke obodo ahu gējuputa kwa n'umu-ntakiri ndikom na umu-ntakiri ndinyom nēgwuri egwú n'amá-ya nile.

6. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Asi na ọ dikari ike ime n'anya ndi nka fọduru n'ubọchi ahu, ọ̀ bu kwa n'anyam ka ọ gādi kari ike ime? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta).

7. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Le, M'gaje izọputa ndim n'ala Ọwuwa-anyanwu, na n'ala Ọdida-anyanwu:

8. M'gēme kwa ka ha bia, ha gēbi kwa n'etiti Jerusalem: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke, n'ezi-okwu na n'ezi omume.

9. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n'ubọchi ndia okwu ndia n'ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n'ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya.

10. N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.

11. Ma ub͕u a ọ bughi dika n'ubọchi mbu nile ka Mu onwem gādiri ndi nka fọduru; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta).

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zekaraia 8