Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zefanaia 1:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.

8. Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M'gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha.

9. M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ.

10. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile.

11. Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha.

12. Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.

13. Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Zefanaia 1