isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Zefanaia 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova nke ruru Zefanaia nwa Kushi, nwa Gedalaia, nwa Amaraia, nwa Hezekaia, nti, n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda.

2. M'gēkpochapusi ihe nile n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

3. M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

4. M'gēseti kwa akam imegide Juda, na imegide ndi nile bi na Jerusalem; M'gēbipu kwa ndi Beal fọduru n'ebe a, na aha ndi-nchu-àjà arusi, ha na ndi-nchu-àjà nile;

5. na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;

6. na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.

7. Dere du n'iru Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ubọchi Jehova di nso: n'ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ.

8. Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M'gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha.

9. M'gēji kwa nmehie onye ọ bula nke nāmabiga nbata-uzọ leta ya n'ubọchi ahu, bú ndi nēmeju ulo ndi-nwe-ha n'ihe-ike na aghughọ.

10. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile.

11. Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha.

12. Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.

13. Àkù-ha gāghọ kwa ihe apunaraworo ha, ulo nile ha gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: e, ha gēwu ulo, ma ha agaghi-ebi nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ma ha agaghi-aṅu manya-vine-ha.

14. Oké ubọchi Jehova di nso, ọ di nso, ọ nēme kwa ngwa nke-uku: ge nti olu ubọchi Jehova; dike nēti nkpu di ilu n'ebe ahu.

15. Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri,

16. ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu.

17. M'gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n'ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí.

18. Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.