isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Habakuk 3 Bible Nso (IGBOB)

1. Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth.

2. Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu:Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile,N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya;N'oké iwe cheta obi-ebere.

3. Chineke si na Timan nābia,Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. SelahEbube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile,Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.

4. Onwunwu-Ya di ka ìhè;Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya:Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.

5. N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga,Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.

6. O guzoro, we tùa uwa;O lere anya, we me ka mba nile kuja:Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi,Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala;Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.

7. N'okpuru ajọ ihe ka m'huworo ulo-ikwū nile nke Kushan:Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.

8. Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide?Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide?Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide?Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile,N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.

9. Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ;Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi. SelahI nēji osimiri b͕awa ala.

10. Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali;Okè miri-ozuzo gabigara:Ob͕u-miri mere ka olu-ya da,Chilie aka-ya elu.

11. Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha;N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga,N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.

12. N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala,N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.

13. I putawo ìhè izọputa ndi-Gi,Izọputa onye-Gi etere manu;I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu,B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah

14. I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi:Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam:Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.

15. I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri,Bú obo nke ọtutu miri.

16. Anurum, afọm we ma jijiji,N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta;Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji:Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu,Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.

17. Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine;Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo,Na ubi nile emeghi ihe-oriri;Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu,Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:

18. Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.

19. Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem,Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele,Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije.Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.