Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 28:29-39 Bible Nso (IGBOB)

29. Eron gēbu kwa aha umu Israel n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n'elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n'iru Jehova mb͕e dum.

30. I gētiye kwa n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n'elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n'iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n'elu obi-ya n'iru Jehova mb͕e dum.

31. I gēme kwa uwe-nwuda ephod, ọ gābusi ogho anunu ogho anunu.

32. Ọnu nke isi-ya gādi n'etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya.

33. I gēme kwa n'ọnu-ọnu-ala-ya pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, n'ọnu-ọnu-ala-ya buru-buru; i gēme kwa ataṅu ọla-edo n'etiti ha buruburu.

34. Otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, gādi n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu.

35. Ọ gādi kwa n'aru Eron iji je ozi: aganānu kwa olu-ya mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ n'iru Jehova, ya na mb͕e ọ nāputa, ka ọ we ghara inwu.

36. I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.

37. I gātukwasi ya n'eriri-nma ogho anunu, ọ gādikwasi n'ákwà-nkukù-isi ahu; n'iru ákwà-nkukù-isi ka ọ gādi.

38. Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova.

39. I gātu-kwa-ra uwe-ime-ya nke ezi ákwà ọcha agwa, i gēme kwa akwa nkechi nke ezi ákwà ọcha, i gēme kwa ihe ike n'úkwù, ọ gābu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 28