Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 15:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Onye-iro siri,M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara:Nkpuru-obim gējuputa na ha,M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

10. I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.

11. Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova?Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ?Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.

12. I setiri aka-nri-Gi,Ala elo ha.

13. N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.

14. Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.

15. Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.

16. Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.

17. I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi,Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 15