Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 6:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. Onye-nchu-aja gēwere ọkwa-aka esiri esi nke ebulu ahu, na otù ob͕e achicha ekoghi-eko sitere na nkata ahu, na otù mbadamba-achicha ekoghi-eko, tiye ha n'elu ọbu-aka abua nke onye-Nazirait ahu, mb͕e ọ kọpusiri isi nke nkewaputa-ya:

20. onye-nchu-àjà gēfé kwa ha ibu àjà-ofufé n'iru Jehova; ihe nsọ ka ọ buru onye-nchu-àjà, tiyere okpukpu-obi nke àjà-ofufé, tiye-kwa-ra utaku-ukwu nke àjà-nbuli: emesia onye-Nazirait ahu gāṅu manya-vine.

21. Nka bu iwu onye-Nazirait onye nēkwe nkwa, na nke onyinye-ya iji biarue Jehova nso bayere nkewaputa-ya, nāgughi ihe aka-ya gēru: dika nkwa-ya si di, nke ọ nekwe, otú a ka ọ gēme n'iwu nkewaputa-ya.

22. Jehova we gwa Moses okwu, si,

23. Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si Otú a ka unu gāgọzi umu Israel; unu gāsi ha,

24. Jehova gọzie gi, debe gi:

25. Jehova me iru-Ya ka ọ mukwasi gi, Jehova me-kwa-ra gi amara:

26. Jehova bulie iru-Ya n'aru gi, nye gi udo.

27. Ha gātukwasi kwa aham n'aru umu Israel; Mu onwem gāgọzi kwa ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 6