Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 5:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Nye umu Israel iwu, ka ha chupu n'ọmuma-ulo-ikwū onye-ekpenta ọ bula na onye ọ bula nwere orùrù, na onye ọ bula ruru árú site na madu nwuru anwu:

3. ma nwoke ma nwayi, unu gāchupu ha, n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka unu gāchupu ha je; ka ha we ghara imeru ọmuma-ulo-ikwū-ha, nke Mu onwem bi n'etiti ha.

4. Umu Israel we me otú a, chupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: dika Jehova gwara Moses okwu, otú a ka umu Israel mere.

5. Jehova we gwa Moses okwu, si,

6. Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ha gēme ihe nime nmehie nile nke madu, imekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ikpe ewe ma nkpuru-obi ahu;

7. ha gēkwuputa kwa nmehie-ha nke ha meworo: ọ gēnyeghachi kwa ihe ikpe mara ya nime ya n'isi-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ya ka ọ gātukwasi ya, nye onye ahu ikpe mara ya bayere ya.

8. Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya.

9. Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.

10. Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.

11. Jehova we gwa Moses okwu, si

12. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwunye nwoke ọ bula gējehie, we mekpue ihe-nmekpu megide ya,

13. ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ewe zopu ihe ahu n'anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu;

14. mọ ekworo ewe garue nwoke ahu aru, o we kwo nwunye-ya ekworo, nwayi ahu ewe rua áru: ma-ọbu mb͕e mọ ekworo gāgarue ya arú, o we kwo nwunye-ya ekworo, ma nwayi ahu arughi árú:

15. nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.

16. Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n'iru Jehova:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 5