Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 4:21-35 Bible Nso (IGBOB)

21. Jehova we gwa Moses okwu, si,

22. Guta kwa ọnu-ọgugu umu Giashon. ha onwe-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di;

23. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha; onye ọ bula nke nābà ibu agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute.

24. Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke ndi Giashon, ifè òfùfè na ibū ibu:

25. ha gēbu kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibim, na ulo-ikwū nzute, ihe-nkpuchi-ya, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal nke dikwasiri ya n'elu, na ákwà-nkwuchi di n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute;

26. na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi di n'onu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu, nke di n'akuku ebe-obibi ahu na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀ nile ha, na ihe nile nke òfùfè-ha, na ihe ọ bula agēmere ha, ha gēfè kwa òfùfè nime ya.

27. N'okwu-ọnu Eron na umu-ya ndikom ka òfùfè nile nke umu ndi Giashon gādi, n'ibu-ha nile, na n'òfùfè-ha nile: unu gēme kwa ka ha nēlekọta ibu-ha nile n'ihe-ndebe-ha.

28. Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu ndi Giashon n'ulo-ikwū nzute: ihe-ndebe-ha gādi n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

29. Umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ka i gāgukọta kwa ha;

30. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri ka i gāgukọta ha, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute.

31. Nka bu kwa ihe-ndebe nke ibu-ha, dika òfùfè-ha nile si di n'ulo-ikwū nzute; ibo nile nke ebe-obibim, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;

32. na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.

33. Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n'ulo-ikwū nzute, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

34. Moses na Eron na ndi-isi nzukọ Israel we gukọta umu ndi Kohat dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

35. site n'onye b͕ara orú arọ na iri gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 4